IGBO CATHOLIC COMMUNITY (ICC) OF NEW YORK, AT ANGELA MERICI PARISH, BRONX, NEW … · 2013. 12....
Transcript of IGBO CATHOLIC COMMUNITY (ICC) OF NEW YORK, AT ANGELA MERICI PARISH, BRONX, NEW … · 2013. 12....
IGBO CATHOLIC COMMUNITY (ICC) OF
NEW YORK,
AT ANGELA MERICI PARISH,
BRONX, NEW YORK.
SUNDAY BULLETIN: 4TH SUNDAY IN
ADVENT (YEAR A)
SUNDAY, DECEMBER 22, 2013
HYMNS:
ENTRANCE: K’ANYI KPOO ISI ALA
OFFERTORY: ONYINYE GI AHU OKWESIRI
EKWESI/CHI N’EMERE M
CONSECRATION: KRISTI DINWENU
COMMUNION: SOON AND VERY SOON
POST COMMUNION: DOZIENU UZO
DISMISSAL: GAANU MEENU KA MBA NILE
EKPERE MMEGHE:
Chineke biko were amara Gi hujuo n’obi anyi. I sitere n’aka Mmuozi zitere anyi ozi obibia nke Nwa Gi.
Mee ka anyi site n’ahuhu na onwu Ya were bata n’ebube nke mbilite n’onwu Ya. Site na Dinwenu anyi
Jesu Kristi Nwa Gi.
IHE OGUGU NKE MBU ewetara n’Akwukwo onye amuma Aizaya 7:10-14
Isi Okwu: “Nwagbogho ahu di ime.”
Onyenweanyi gwara Ahaz okwu ozo si: “Rio Oseburuwa Chineke gi ihe iriba ama maka onwe gi. I nwere
ike irio ka ihe ahu si n’ebe miri emi n’ala mmuo biara gi; ma o bu n’ebe di oke elu nke igwe. Mana
Ahaz zara ya si: “Mba! Agaghi m anwa Onyenwe m onwunwa.” Onyenweanyi asikwa ya: ulo Devid
ngwa gee nti ugbu a: “O bu na o zubeghiri gi ikpasu ndi mmadu iwe? O ruokwala nke ikpasu Chineke
iwe?” N’ihi ya ugbu a, Onyenweanyi ga-eji aka Ya enye gi ihe iriba ama. Lee ihe iriba ama ahu
Nwagbogho ahu di ime. N’oge na-adighi anya, o ga-amukwa nwa nwoke. Aha a ga-akpo Ya bu
Immanuel, nke putara “Chineke nonyeere anyi.”
Okwu nke Oseburuwa
Ekele diri Chukwu
ABUOMA NA AZIZA YA
Aziza: Ka Onyenweanyi bata. O bu Eze nke otito
1. Onyenweanyi new uwa na ihe nile juru n’ime ya. Uwa na mmadu dum bi n’ime ya. O bu Ya
guzowere ya n’elu osimiri. O mere ka o guzosie ike n’elu mmiri. Aziza
2. Onye ga-agbago n’ugwu nke Onyenweanyi? Onye ga-eguzo n’ebe nso Ya? Onye aka ya kwu oto,
onye obi ya di ocha. Onye anaghi acho ihe na-abaghi uru. Aziza
3. O ga-anata ngozi n’aka Onyenweanyi. Natakwa ugwo n’aka Chineke onye nzoputa ya. O bu udi
mmadu ndi a na-acho Ya. Na-achonu ihu Chineke nke Jekop. Aziza.
IHE OGUGU NKE ABUO ewetara n’Akwukwo Ozi nke Pol di aso degaara ndi Rome. 1:1-7
Isi Okwu: Jesu Kristi bu Nwa Devid, burukwa Nwa Chineke
Pol odibo Kristi Jesu, onye Chineke kporo ibu ony ozi, na onye O weputara iche ikwusa Ozioma, na-
edetara unu akwukwo ozi nke a. Chineke kwere nkwa na mgbe ochie izi anyi Ozi Oma nke a, site n’onu
ndi amuma Ya, dika e dere n’Akwukwo Nso. Ozioma nke a bum aka Nwa Ya bu ONyenweanyi, Jesu
Kristi. A bia n’igho mmadu o ghoro, a muru Ya n’agburu Devid. A bia n’ibu Chi din so nke O bu, Chineke
jiri ike ukwu gosi na o bu Nwa Ya, site n’ime ka O si n’onwu bilie. Site n’aka Ya, Chineke nyere m amara
ibu onye ozi n’ihi Kristi, ka m wee mee ka mba nile kwere na Chineke , na-aňakwa Y anti. Unu ndi bi na
Rome, ndi a kporo ibu ndi nke Jesu Kristi, sokwa na ndi a nile m ga-eme ka ha kwere na Chineke,
ňakwaa Y anti. Ya mere, ana m edetara unu nile ndi bi na Rome, akwukwo ozi, unu bu ndi Chineke huru
n’anya, na ndi O kporo ibu ndi nso. Amara diri unu, ya na udo nke si n’aka Chineke Nna na nke
Onyenweanyi Jesu Kristi.
Okwu nke Oseburuwa
Ekele diri Chukwu.
ALLELUYA
Aleluya, aleluya!! Nwagbogho ga-aturu ime n’amaghi nwoke, biakwa muta nwa nwoke. Aha a ga-aba
ya bu Immanuel: ihe o putara bu: Chineke nonyeere anyi. Aleluya!!!
OZIOMA di aso nke Matiu dere 1:18-25
Isi Okwu: Maria, onye Josef nwa Devid biara iluru bu onye muru Jesu.
Otu a ka e si muo Jesu Kristi: Mgbe ahu ikwu na ibe ekwekoritala na Josef ga-alu Maria nne Jesu. Ma
mgbe ha na-ebikobeghi, a huru na Maria di ime site n’ike nke Mmuo Nso. Ma ebe Josef di ya, bu onye
ezi omume, o choghi ikpoputara ya oha, kama o zubere ichu ya na nzuzo. Ma mgbe o na-atughari ihe
ndi a n’obi ya, mmuo ozi nke Onyenweanyi gosiri ya onwe ya na nro, si: “Josef, nwa Devid, atula egwu
ikporo Maria nwunye gi, n’ihi na Nwa o di ime ya sitere n’ike nke Mmuo Nso. O ga-amu nwa nwoke. I
ga-akpokwa Ya Jesu, n’ihi na O ga-azoputa ndi nke Yan a mmehie ha nile.” Ihe ndi a nile mere ka e wee
mezuo okwu nke Onyenweanyi siri n’onu onye amuma kwuo si: “Lee, nwagbogho na-amaghi nwoke
ga-adi ime, muta nwa nwoke. Aha a ga-akpo Ya bu Immanuel,” nke isi ya bu: “Chineke nonyeere anyi.”
Ya mere mgbe Josef tetara n’ura, o mere dika mmuo ozi nke Onyenweanyi gwara ya, wee kporo Maria
nwunye ya. Ma o bakwughi ya ruo mgbe o muchara nwa. Josef wee kpoo aha ya Jesu.
Ozioma nke Oseburuwa.
Otito diri Kristi.
EKPERE NHUNYE
Dinwenu, anyi ji aňuri na-ebute onyinye n’ebe nchuaja Gi. Dika I si were Mmuo Gi doo Maria aso, mgbe
o di ime nke So Otu Nwa Gi, biko were otu Mmuo ahu doo oninye ndi a nso. Site na Kristi
Onyenweanyi.
EKPERE ANATACHAA ORIRI NSO
Chineke puru ime ihe nile, I nyela anyi oriri nso nke a iji gba anyi ibe nkwa nke ndu ebighi ebi I kwere
anyi. Anyi na-ario Gi, otu anyi na-erute nso na nnukwu oriri nke nzoputa, mee ka anyi were nsopuru na-
eme emume ihe omimi nke omumu Kristi Nwa Gi. Onye Gi na Ya di ndu na-achi ebighi ebi ebighi ebi.
[4TH SUNDAY OF ADVENT REFLECTION]
People who are desperate often delve into all kinds of things in the bid to save themselves. Desperate people can easily form an ungodly and profane alliance. They can even make a deal with the devil and shun God. Desperation could span from quest for power, material
acquisition, fame, etc. Out of desperation for quick riches people cheat, lie, kill, (ritual offering) and even steal. "Desperation is the perfume of the young actor. It’s so satisfying to have gotten rid of it. If you keep smelling it, it can drive you crazy. In this business a lot of people go nuts, eccentric, even end up dead from it. Not my plan".- Uma Thurman. The Lord warns us to stay
away from love of money (1Tim.6:10, Heb13:5) king Ahaz of Judah was desperate to remain in power that he lost hope in his subjects, the prophet and also distrusted God. He formed an unholy alliance with pagan king of Assyria against the impending allied forces of Israel and
Syria. The prophet approached him and asked him to ask God for a sign as evidence of protection. He stubbornly refused thus the prophet gave him a sign of the virginal conception of
the future Messianic king of the tribe of David as promised through prophet Nathan (2Sam.7:12-16) In his blindness and desperation Ahaz failed to see "sign from God"
"Remember the marvelous works which He has done" 1Chr.16:12. That miraculous sign is the fact that an "alma" (a girl of marriageable age, a virgin) conceived and bore a child without any
normal natural relations with a man. More miraculous is the fact that the child is God. Mere mortals bearing gods. IMMANUEL -God is with us. If God is for us, who can be against us?
Rom.8:28-31 We are called to have faith in God, trust Him, obey Him, listen to Him, and aspire to be saints which is part of our Christian vocation. May the child Jesus be born again in our hearts and household in order to experience peace, joy and love that come with it. MERRY
CHRISTMAS.
Produced by ICC Choir